Numbers 2

Usoro ebo dị iche iche

1 Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị ha, 2“Ụmụ Izrel ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ụlọ nzute, nʼebe dịpụturu adịpụ site nʼụlọ nzute ahụ. Onye ọbụla ga-ama ụlọ ikwu ya nʼakụkụ ọkọlọtọ ebo ya, ha na ihe ịrịbama nke ụlọ ha.”

3Nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ,
usuu ndị agha ebo Juda, ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha ga-abụ Nashọn nwa Aminadab.
4Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ya dị puku iri asaa na anọ, na narị isii (74,600)
5Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Isaka ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Netanel nwa Zua. 6Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku anọ na narị anọ (54,400).
7Nʼakụkụ ha ka usuu ndị agha ebo Zebụlọn ga-amanye ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Eliab nwa Helọn. 8Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku asaa na narị anọ (57,400).
9Ọnụọgụgụ ndị niile a gụkọtara ha na Juda nʼọwụwa anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku asatọ na puku isii na narị anọ (186,400). Ha ga-ebu ụzọ bulie ije.

10Nʼakụkụ ndịda ka
usuu ndị agha ebo Ruben ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Elizọ nwa Shedeua.
11Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku isii na narị ise (46,500).
12Nʼakụkụ ha ka ebo Simiọn ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Shelumiel nwa Zurishadai. 13Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku itoolu na narị atọ (59,300).
14Ebo Gad ga-esokwa ha. Onyendu ha bụ Eliasaf nwa Deuel.
Nʼime ọtụtụ akwụkwọ ndị Masoreti, akwụkwọ ise nke ndị Samarịa nakwa akwụkwọ Vọlgetị, nʼisi mbụ na amaokwu iri na anọ ha, ihe e dere bụ Reuel
15Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, puku ise na narị isii na iri ise (45,650).
16Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ruben bikọrọ na ndịda ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na otu, na narị anọ na iri ise (151,450) dịka usuu ndị agha ha si dị. Ebo atọ a bụ ndị na-eso ebo atọ nke mbụ ahụ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.

17Ka ụlọ nzute na-azọli ije, ụlọ ikwu ndị Livayị ga-anọ nʼetiti ụlọ ikwu ndị ọzọ. Ha ga-ebili ije nʼusoro dịka ha si maa ụlọ ikwu ha. Ndị ọbụla nʼọnọdụ ha, nʼokpuru ọkọlọtọ nke na-akọwa ndị ha bụ.

18Nʼakụkụ ọdịda anyanwụ
ka ebo Ifrem ga-ama ụlọ ikwu ha dịka ọkọlọtọ ha si dị. Onyendu ha bụ Elishama nwa Amihud.
19Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ na narị ise (40,500).
20Ebo Manase ga-amakwa ụlọ ikwu nʼakụkụ ha. Onyendu ha bụ Gamaliel nwa Pedazo. 21Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku abụọ na narị abụọ (32,200).
22Nʼakụkụ ha ka ebo Benjamin ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Abidan nwa Gidiọn. 23Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku atọ, puku ise na narị anọ (35,400).
24Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Ifrem bikọrọ nʼakụkụ ọdịda anyanwụ nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, puku asatọ na narị mmadụ (108,100). Ha niile na-esokwa nʼazụ ndị Livayị na ụlọ nzute ahụ. Ndị a bụ ndị na-eso nʼọnọdụ nke atọ nʼoge ọbụla ụmụ Izrel nọ nʼije.

25Ebo Dan na usuu ndị agha ha
ga-ama ụlọ ikwu ha nʼakụkụ elu elu nʼokpuru ọkọlọtọ ha. Onyendu ha bụ Ahieza nwa Amishadai
26Ọnụọgụgụ usuu ha dị iri puku isii, puku abụọ na narị asaa (62,700).
27Nʼakụkụ ha ka ebo Asha ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Pagịel nwa Okran. 28Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku anọ, otu puku na narị ise (41,500).
29Otu aka ahụ ka ebo Naftalị ga-ama ụlọ ikwu ha. Onyendu ha bụ Ahira nwa Enan. 30Ọnụọgụgụ usuu ndị agha ha dị iri puku ise, puku atọ na narị anọ (53,400).
31Ya mere ọnụọgụgụ ndị niile ha na Dan bikọrọ nʼakụkụ elu elu nke ụlọ nzute ahụ dị narị puku, iri puku ise na puku asaa na narị isii (157,600). Ha ga-abụ ndị ga-ekpe azụ bilie ije nʼokpuru ọkọlọtọ ha.

32Ndị a bụ ndị Izrel, ndị a gụrụ ọnụ dịka ezinaụlọ ha si dị. Ndị ikom niile nọ nʼọmụma ụlọ ikwu, dịka usuu ha dị iche iche si dị, narị puku isii, puku atọ na narị ise na iri ise (603,550) nʼọnụọgụgụ. 33Ma otu ọ dị, a gụnyeghị ebo Livayị nʼọnụọgụgụ b ndị Izrel ndị ọzọ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.

34Ya mere, ndị Izrel mere ihe niile dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. Otu a ka ha si maa ụlọ ikwu ha nʼakụkụ ọkọlọtọ ha. Otu a kwa ka ha si ebuli ije. Onye ọbụla nʼime ha dịka ebo ha na ezinaụlọ ha si dị.

Copyright information for IboBIU